-
Ọpụpụ 28:6-8Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
6 “Ha ga-eji ọlaedo, eri na-acha anụnụ anụnụ, ajị anụ na-acha pọpụl, eri na-acha uhie uhie, na ezigbo eri linin a kpara akpa kpaa efọd ahụ, a ga-akpakwa ihe ịchọ mma na ya.+ 7 Ọ ga-enwe ubu ihu na azụ bụ́ ndị a ga-ejikọta n’ebe elu ya abụọ. 8 A ga-eji ihe ndị e ji kpaa efọd ahụ kpaa eriri*+ ga-adị na ya, nke a ga-eji na-ekegide ya, ya bụ, ọlaedo, eri na-acha anụnụ anụnụ, ajị anụ na-acha pọpụl, eri na-acha uhie uhie, na ezigbo eri linin a kpara akpa.
-