30 Mosis wee weretụ mmanụ e ji ete mmadụ mmanụ+ na ọbara dị n’ebe ịchụàjà fesa n’ahụ́ Erọn nakwa n’uwe ya, fesakwa n’ahụ́ ụmụ ya ndị nwoke nakwa n’uwe ụmụ ya ndị nwoke. O si otú a mee ka Erọn na uwe ya dị nsọ, meekwa ka ụmụ ya ndị nwoke+ na uwe ha dị nsọ.+