35 O wee jiri eri na-acha anụnụ anụnụ, ajị anụ na-acha pọpụl, eri na-acha uhie uhie, na ezigbo eri linin a kpara akpa kpaa ákwà mgbochi.+ Ọ kpara ndị cherob na ya.+
19 Ụmụnna m, ebe ọ bụ na ọbara Jizọs na-eme ka obi sie anyị ike isi n’ụzọ e si abanye n’ebe nsọ*+ ahụ na-abanye, 20 bụ́ ụzọ ọhụrụ o megheere anyị nke na-eduba ná ndụ, nke e si n’ákwà mgbochi ahụ abanye,+ ya bụ, ahụ́ ya,