8 O biliri rie nri, ṅụọkwa mmiri, nwetazie ume o ji gaa ije ụbọchị iri anọ, ehihie na abalị. Ọ gagidere ruo Horeb, bụ́ ugwu nke ezi Chineke.+
9 Mgbe o ruru ebe ahụ, ọ banyere n’otu ọgba,+ rahụkwa na ya n’abalị ahụ. Ma, Jehova jụrụ ya, sị: “Ịlaịja, gịnị ka ị na-eme ebe a?”