22 “Ọ bụ iwu ndị a ka Jehova nyere ọgbakọ unu niile n’ugwu ahụ. O si n’ọkụ, n’ígwé ojii, nakwa n’oké ọchịchịrị+ kwuo ya n’olu dara ụda, e nweghịkwa ihe ọzọ ọ gbakwụnyere na ya. O deziri ha ná mbadamba nkume abụọ ma nye m ha.+
38 Mosis a na ndị Izrel ibe ya nọrọ n’ala ịkpa. Ọ na-abụ mmụọ ozi+ gwa ya okwu+ n’Ugwu Saịnaị, yanwa agwa ndị nna nna anyị. Ọ nụkwara okwu Chineke, nke na-enye ndụ, ma gwa anyị ya.+