38 Mosis a na ndị Izrel ibe ya nọrọ n’ala ịkpa. Ọ na-abụ mmụọ ozi+ gwa ya okwu+ n’Ugwu Saịnaị, yanwa agwa ndị nna nna anyị. Ọ nụkwara okwu Chineke, nke na-enye ndụ, ma gwa anyị ya.+
19 Gịnịzi mere e ji nye Iwu ahụ?* E nyere ya ka a mata ihe ọjọọ ndị mmadụ na-eme+ ruo mgbe nwa* ahụ ga-abịa,+ bụ́ onye e kwere nkwa ahụ. E nyere ya ndị mmụọ ozi,+ ha esi n’aka onye ogbugbo nyeruo ya.+