35 Ndị Izrel mere ihe Mosis gwara ha. Ha rịọrọ ndị Ijipt ihe ndị e ji ọlaọcha mee na ihe ndị e ji ọlaedo mee nakwa ákwà.+36 Jehova mere ka ihe ha masị ndị Ijipt, nke mere na ha nyere ha ihe ndị ha rịọrọ. Ha wee gbawa ndị Ijipt aka.+
34 O ji ọlaedo machie frem ndị ahụ. O jikwa ọlaedo rụọ ihe ndị dị okirikiri ga-ejide okporo osisi ndị ahụ, jirikwa ọlaedo machie okporo osisi ndị ahụ.+