11 Ọtụtụ mba ga-esonyere Jehova n’ụbọchị ahụ,+ ha ga-aghọkwa ndị m. M ga-ebikwa n’ime gị.” Ị ga-amata na ọ bụ Jehova nke ụsụụ ndị agha zitere m ka m bịakwute gị.
16 Gịnị jikọrọ arụsị na ụlọ nsọ Chineke?+ Anyị bụ ụlọ nsọ nke Chineke dị ndụ,+ otú ahụ Chineke kwuru, sị: “Mụ na ha ga-ebi.+ M ga-anọnyere ha. M ga-abụ Chineke ha, ha ga-abụkwa ndị m.”+