27 “Ma, ụbọchị nke iri n’ọnwa nke asaa ahụ ga-abụ Ụbọchị Ikpuchi Mmehie.+ Unu ga-enwe mgbakọ dị nsọ. Unu ga-emekpa onwe* unu ahụ́,*+ chụọkwara Jehova àjà a na-esu ọkụ.
7 Ma, ọ bụ naanị nnukwu onye nchụàjà na-abanye ná nkebi nke abụọ. Ọ na-abanye na ya otu ugboro n’afọ.+ O mekataghị banye ma ọ bụrụ na o jighị ọbara+ o ji achụ àjà maka mmehie ya+ nakwa maka mmehie ndị Izrel+ mere n’amaghị ụma.