30 O wee dọsa nnukwu ite ahụ n’agbata ụlọikwuu nzute na ebe ịchụàjà ahụ ma gbanye ya mmiri.+31 Mosis na Erọn na ụmụ ya ndị nwoke ji mmiri si na ya saa aka ha na ụkwụ ha.
22 ka anyị jiri ezi obi na-abịa Chineke nso ma nwee okwukwe siri ezigbo ike, ebe ọ bụ na e meela ka obi anyị dị ọcha ka anyị ghara inwe akọnuche ọjọọ,+ e jirikwa mmiri dị ọcha sachaa ahụ́ anyị.+