17 N’ihi na n’Akwụkwọ Nsọ, Chineke gwara Fero, sị: “Ọ bụ ihe a mere m ji hapụ gị ndụ: ka m wee jiri gị gosi ike m, ka m wee mee ka a kọsaa aha m n’ụwa niile.”+ 18 N’ihi ya, ọ bụ onye ọ chọrọ ka ọ na-emere ebere, ma ọ na-ahapụ onye ọ bụla ọ chọrọ ka ọ gbaa isi akwara.+