13 Ma Mosis gwara ezi Chineke, sị: “Ọ bụrụ na mụ agakwuru ndị Izrel sị ha, ‘Chineke nna nna unu hà zitere m ka m bịakwute unu,’ ha asị m, ‘Gịnị bụ aha ya?’+ Gịnị ka m ga-agwa ha?”
6 Jehova nọ na-agafe n’ihu ya ma na-ekwu, sị: “Jehova, Jehova, Chineke nwere ọmịiko*+ ma na-eme ebere,+ onye na-anaghị ewe iwe ọsọ ọsọ,+ onye ịhụnanya ya*+ na eziokwu ya+ dị ukwuu,