-
Ọpụpụ 29:24Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
24 Ị ga-achịkwasị ha niile n’ọbụ aka Erọn nakwa n’ọbụ aka ụmụ ya ndị nwoke. Ị ga-efegharịkwa ha ka ha bụrụ àjà a na-efegharị efegharị n’ihu Jehova.
-
-
Levitikọs 8:25-27Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
25 O wee were abụba ya, ọdụ ya nke bụ́ abụba abụba, abụba niile dị n’elu eriri afọ ya, na abụba kpuchiri imeju ya, akụrụ ya abụọ na abụba ha, na ụkwụ aka nri ya.+ 26 O si na nkata achịcha na-ekoghị eko dị na ya, nke dị n’ihu Jehova, were otu ogbe achịcha na-ekoghị eko dị okirikiri+ na otu ogbe achịcha dị okirikiri a gwara mmanụ+ na otu achịcha dị fere fere. Ọ tụkwasịrị ha n’elu abụba ndị ahụ na ụkwụ aka nri anụ ahụ. 27 O wee chịkwasị ha niile n’ọbụ aka Erọn nakwa n’ọbụ aka ụmụ ya ndị nwoke ma malite ifegharị ha ka ha bụrụ àjà a na-efegharị efegharị n’ihu Jehova.
-