-
Ọpụpụ 29:22-25Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
22 “Ị ga-ewerezi abụba ebule ahụ, ọdụ ya nke bụ́ abụba abụba, abụba nke kpuchiri eriri afọ ya, abụba kpuchiri imeju ya, akụrụ ya abụọ na abụba dị n’elu ha,+ na ụkwụ aka nri ya, n’ihi na ọ bụ ebule e ji ahọpụta ndị nchụàjà.+ 23 Sikwa na nkata ahụ achịcha na-ekoghị eko dị na ya nke dị n’ihu Jehova were otu ogbe achịcha dị okirikiri na otu ogbe achịcha dị okirikiri a gwara mmanụ na otu achịcha dị fere fere. 24 Ị ga-achịkwasị ha niile n’ọbụ aka Erọn nakwa n’ọbụ aka ụmụ ya ndị nwoke. Ị ga-efegharịkwa ha ka ha bụrụ àjà a na-efegharị efegharị n’ihu Jehova. 25 Ị ga-achịrịzi ha n’aka ha ma suo ha ọkụ n’ebe ịchụàjà ahụ, n’elu àjà ahụ a na-esu ọkụ, ka ọ bụrụ ihe na-esi ísì ọma* n’ihu Jehova. Ọ bụ àjà a na-esu ọkụ nke a na-achụrụ Jehova.
-