4 “Ọ bụ uwe ndị a ka ha ga-akpa: akpa a na-anya n’obi,+ efọd,+ uwe na-enweghị aka,+ uwe mwụda a kpara n’ụdị pụrụ iche,* ákwà isi,+ na ákwà a na-eke n’úkwù.+ Ha ga-akpara Erọn nwanne gị na ụmụ ya ndị nwoke uwe nsọ ndị a, ka ha wee bụrụ ndị nchụàjà m.
33 Ha buteziiri Mosis ihe niile a ga-eji rụọ ụlọikwuu ahụ,+ ha na ákwà ụlọikwuu ahụ+ na ihe ndị ga-adị na ya: nko ya,+ frem ya,+ okporo osisi ya+ na ogidi ya na ntọala ya ndị nwere oghere;+