15 “Hụ na onye na-akpa ihe n’ákwà kpara akpa a na-anya n’obi nke e ji ekpe ikpe.+ A ga-eme ya ka ọ dị ka efọd ahụ. A ga-eji ọlaedo, eri na-acha anụnụ anụnụ, ajị anụ na-acha pọpụl, eri na-acha uhie uhie, na ezigbo eri linin a kpara akpa kpaa ya.+
9 O nwere akụkụ anọ há nhata mgbe a pịajiri ya abụọ. Ha kpara akpa ahụ a na-anya n’obi ya adị otu ntụ ọbụ aka* n’ogologo nakwa n’obosara mgbe a pịajiri ya abụọ.