36 Kwa ụbọchị, ị ga-eji oké ehi chụọ àjà mmehie maka ikpuchi mmehie. Ị ga-emekwa ka ebe ịchụàjà ahụ dị nsọ. Otú ị ga-esi eme ya bụ ịchụrụ ya àjà ikpuchi mmehie, ị ga-etekwa ya mmanụ ka i wee mee ka ọ dị nsọ.+
11 N’ihi na ndụ* anụ ahụ́ dị n’ọbara ya.+ Enyekwala m ya unu ka unu jiri ya na-ekpuchiri onwe* unu mmehie,+ maka na ọ bụ ọbara na-ekpuchi mmehie+ n’ihi na ndụ* dị na ya.