-
Levitikọs 2:2Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
2 Ọ ga-ebuteziri ya ụmụ Erọn, bụ́ ndị nchụàjà. Onye nchụàjà ga-ekporo ntụ ọka e gwere nke ọma ga-eju ọbụ aka ya nakwa mmanụ na frankinsens ya niile, ọ ga-esukwa ya ọkụ ka ọ kwụọ anwụrụ ọkụ n’ebe ịchụàjà, ka ọ bụrụ ihe nọchiri anya àjà+ e wetara. Ọ bụ àjà a na-esu ọkụ, àjà na-esi ísì ọma* a na-achụrụ Jehova.
-
-
Levitikọs 5:11, 12Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
11 “‘Ma ọ bụrụ na ọ gaghị ewetali nduru abụọ ma ọ bụ ụmụ kpalakwukwu abụọ, ọ ga-eweta otu ụzọ n’ụzọ iri nke otu efa*+ ntụ ọka e gwere nke ọma ka ọ bụrụ àjà mmehie maka mmehie ya. Ọ gaghị awụ mmanụ n’elu ya ma ọ bụ tụkwasị frankinsens n’elu ya n’ihi na ọ bụ àjà mmehie. 12 Ọ ga-ewetara ya onye nchụàjà. Onye nchụàjà ga-ekporo ntụ ọka ga-eju ọbụ aka ya ka ọ bụrụ ihe nọchiri anya àjà o wetara, ọ ga-esukwa ya ọkụ ka ọ kwụọ anwụrụ ọkụ n’ebe ịchụàjà, n’elu àjà Jehova e suru ọkụ. Ọ bụ àjà mmehie.
-