-
Ọpụpụ 29:38-41Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
38 “Ihe ndị a ka ị ga-achụ n’àjà n’ebe ịchụàjà ahụ mgbe niile: ụmụ ebule abụọ ndị gbara otu afọ otu afọ kwa ụbọchị.+ 39 Chụọ otu ebule n’àjà n’ụtụtụ, chụọkwa ebule nke ọzọ n’àjà ná mgbede.*+ 40 Ihe ndị ị ga-eji chụọ ebule nke mbụ n’àjà bụ otu ụzọ n’ụzọ iri nke otu efa* ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara otu ụzọ n’ụzọ anọ nke otu hin* mmanụ oliv, nakwa otu ụzọ n’ụzọ anọ nke otu hin mmanya nke ga-abụ àjà mmanya. 41 Ị ga-achụ ebule nke abụọ n’àjà ná mgbede.* Ị ga-eji àjà ọka na àjà mmanya ga-adị ka nke ụtụtụ chụọ ya. Ị ga-achụ ya n’àjà ka ọ bụrụ ihe na-esi ísì ọma,* bụ́ àjà a na-esu ọkụ nke a na-achụrụ Jehova.
-
-
Ọnụ Ọgụgụ 28:4-6Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
4 Ị ga-achụ otu ebule n’àjà n’ụtụtụ, chụọkwa ebule nke ọzọ n’àjà ná mgbede.*+ 5 Ị ga-eji otu ụzọ n’ụzọ iri nke otu efa* ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara otu ụzọ n’ụzọ anọ nke otu hin* mmanụ oliv, chụọ nke ọ bụla n’ime ha n’àjà ka ọ bụrụ àjà ọka.+ 6 Ọ bụ àjà a na-esu ọkụ mgbe niile,+ nke m kwuru n’Ugwu Saịnaị ka a na-achụ ka ọ bụrụ àjà na-esi ísì ọma,* àjà a na-esu ọkụ a na-achụrụ Jehova,
-