28 ọ bụkwa otú ahụ ka a chụrụ Kraịst n’àjà naanị otu ugboro ka o buru mmehie ọtụtụ ndị.+ Mgbe ọ ga-apụta nke ugboro abụọ, ọ gaghị abụ ka o wepụ mmehie, ndị na-achọsi ya ike ka a zọpụta ha ga-ahụkwa ya.+
24 O buuru mmehie anyị+ n’ahụ́ ya mgbe a kpọgidere ya n’osisi,+ ka anyị wee sepụ aka ná mmehie ma na-eme ihe dị mma. “Ahụ́ e merụrụ ya mekwara ka a gwọọ unu.”+