21 Erọn ga-ebikwasị aka ya abụọ n’isi mkpi ahụ dị ndụ ma kwupụta ihe ọjọọ niile ndị Izrel mere na nnupụisi ha niile na mmehie ha niile n’isi mkpi ahụ. Ọ ga-eme ka ha dịrị n’isi mkpi ahụ.+ Ọ ga-edunyezi otu nwoke a họpụtara ka ọ kpụrụ mkpi ahụ kpụga ya n’ala ịkpa.