27 Ha wee jiri ezigbo eri linin kpaara Erọn na ụmụ ya ndị nwoke uwe mwụda dị iche iche.+ Ọ bụ onye na-akpa ákwà kpara ha. 28 Ha jikwa ezigbo eri linin kpaa ákwà isi+ na ákwà ịchọ mma ụmụ Erọn ga na-eke n’isi,+ jiri ezigbo eri linin a kpara akpa kpaa uwe úkwù.+