4 Ọ ga-eyiri uwe mwụda dị nsọ e ji eri linin kpaa,+ yirikwa uwe úkwù+ e ji eri linin kpaa nke ga-ekpuchi ahụ́ ya. Ọ ga-ekekwa onwe ya ákwà a na-eke n’úkwù e ji eri linin kpaa,+ keekwa ákwà isi e ji eri linin kpaa.+ Ha bụ uwe dị nsọ.+ Ọ ga-eji mmiri saa ahụ́,+ yirizie ha.