13 “Gwa ndị Izrel, sị, ‘Hụnụ na unu na-edebe ụbọchị izu ike m,+ n’ihi na ọ bụ ihe na-egosi na mụ na unu agbaala ndụ n’ọgbọ unu niile, ka unu wee mara na ọ bụ mụnwa, bụ́ Jehova, na-eme ka unu dị nsọ.
8 Unu ga-ewere ya ka onye dị nsọ+ n’ihi na ọ bụ ya na-ewetara Chineke unu achịcha. Unu ga-ewere ya ka onye dị nsọ n’ihi na mụnwa bụ́ Jehova, onye kpọpụtara unu iche ka unu dị nsọ, dị nsọ.+
23 Ka Chineke nke udo mee ka unu dị nsọ otú zuru ezu. Ụmụnna anyị, ka e meekwa ka àgwà ọma* unu na ndụ* unu na ahụ́ unu ghara inwe ntụpọ ọ bụla n’oge ọnụnọ Onyenwe anyị Jizọs Kraịst.+
13 Ma, ụmụnna anyị Jehova* hụrụ n’anya, anyị agaghị akwụsị ịna-ekele Chineke mgbe niile n’ihi unu maka na Chineke si ná mmalite họrọ unu+ ka a zọpụta unu. Otú o si mee ya bụ na o ji mmụọ nsọ ya na okwukwe unu nwere n’eziokwu ahụ mee ka unu dị nsọ.+