Ọpụpụ 18:15, 16 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 15 Mosis gwara nna nwunye ya, sị: “Ọ bụ maka na ha na-abịakwute m ka m jụọ Chineke ase. 16 Ha nwee ikpe, ha na-abịakwute m. M na-ekpere otu onye na ibe ya ikpe, m na-emekwa ka a mata ihe ezi Chineke kpebiri nakwa iwu ya.”+ Ọnụ Ọgụgụ 15:32 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 32 Mgbe ndị Izrel nọ n’ala ịkpa, ha hụrụ otu nwoke ka ọ na-akpa nkụ n’Ụbọchị Izu Ike.+ Ọnụ Ọgụgụ 15:34 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 34 Ha jichiri ya+ n’ihi na e kwubeghị ihe a ga-eme ya.
15 Mosis gwara nna nwunye ya, sị: “Ọ bụ maka na ha na-abịakwute m ka m jụọ Chineke ase. 16 Ha nwee ikpe, ha na-abịakwute m. M na-ekpere otu onye na ibe ya ikpe, m na-emekwa ka a mata ihe ezi Chineke kpebiri nakwa iwu ya.”+