-
Levitikọs 27:11-13Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
11 Ọ bụrụ na ọ bụ anụmanụ na-adịghị ọcha,+ nke a na-agaghị ejili chụọrọ Jehova àjà, ọ ga-akpụta anụ ahụ ma kwụwa ya n’ihu onye nchụàjà. 12 Onye nchụàjà ga-ekwu ego ole a ga-akwụ n’isi ya. Ọ bụ otú anụmanụ ahụ dị ka ọ ga-eji kpebie ya. Ego ole ọ bụla onye nchụàjà kwuru ka ọ ga-abụ. 13 Ma ọ bụrụ na e nwee ka o si chọọ ịzụrụghachi ya, ọ ga-akwụ ego ole e kwuru na ọ bụ ọnụ ahịa anụmanụ ahụ, kwụọkwa otu ụzọ n’ụzọ ise nke ego ahụ.+
-