-
Ọnụ Ọgụgụ 18:15, 16Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
15 “Nwa mbụ nke ihe niile dị ndụ*+ ha ga-ewetara Jehova, ma ọ̀ bụ mmadụ ma ọ̀ bụ anụmanụ, ga-abụ nke gị. Ma, ị ga-agbara nwa mbụ mmadụ mụrụ.+ Ị ga-agbarakwa nwa mbụ anụmanụ na-adịghị ọcha mụrụ.+ 16 Ị ga-eji ego ole e ji agbara ya gbara ya mgbe ọ dị otu ọnwa ma ọ bụ karịa, ya bụ, shekel* ọlaọcha ise e kwuru na ọ bụ ọnụ ahịa ya,+ ma e jiri shekel dị n’ebe nsọ* tụọ ya. Ọ bụ gira* iri abụọ.
-