26 “‘Ma, e nweghị onye kwesịrị inye Chineke anụmanụ e bu ụzọ mụọ ka ọ bụrụ ihe dị nsọ, n’ihi na anụmanụ ọ bụla e bu ụzọ mụọ bụ nke Jehova.+ Ma ọ̀ bụ ehi ma ọ̀ bụ atụrụ, ọ bụ Jehova nwe ya.+
13 N’ihi na ọ bụ m nwe nwa ọ bụla e bu ụzọ mụọ.+ Ọ bụ n’ụbọchị m gburu nwa ọ bụla e bu ụzọ mụọ n’Ijipt+ ka m mere ka nwa ọ bụla e bu ụzọ mụọ n’Izrel dịrị m nsọ, malite na mmadụ ruo n’anụmanụ.+ Ha ga-abụ nke m. Abụ m Jehova.”