-
Ọnụ Ọgụgụ 7:6-9Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
6 Mosis wee nara ụgbọala ndị ahụ anụmanụ na-adọkpụ na ehi ndị ahụ ma nye ha ndị Livaị. 7 O nyere ụmụ Geshọn ụgbọala abụọ na ehi anọ ha ga-eji na-arụ ọrụ e nyere ha.+ 8 O nyekwara ụmụ Meraraị ụgbọala anọ na ehi asatọ ha ga-eji na-arụ ọrụ e nyere ha. Ọ bụ Ịtama nwa Erọn onye nchụàjà ka o nyefere ha.+ 9 Ma e nweghị nke o nyere ụmụ Kohat n’ihi na ọrụ ha gbasara ebe nsọ.+ Ọ bụkwa n’ubu ha ka ha na-ebu ihe ndị dị nsọ.+
-