29 N’etiti abalị, Jehova gburu nwa ọ bụla e bu ụzọ mụọ n’Ijipt,+ malite na nwa mbụ Fero, onye nọ n’ocheeze, ruo na nwa mbụ nke onye a dọtara n’agha nọ n’ụlọ mkpọrọ, nakwa nwa ọ bụla anụmanụ bu ụzọ mụọ.+
15 Mgbe Fero siri ọnwụ na ya agaghị ahapụ anyị ka anyị gawa,+ Jehova gburu nwa ọ bụla e bu ụzọ mụọ n’Ijipt, malite na nwa mbụ mmadụ mụrụ ruo na nwa mbụ anụmanụ mụrụ.+ Ọ bụ ya mere m ji achụrụ Jehova oké ọ bụla e bu ụzọ mụọ* n’àjà, na-agbarakwa nwa nwoke ọ bụla e bu ụzọ mụọ n’ụmụ m ndị nwoke.’