2 “Ndị Izrel ga-ama ụlọikwuu ha n’ebe ìgwè ebo atọ+ nke ebo ha so na ya mara ụlọikwuu. Nwoke ọ bụla ga-ama ụlọikwuu ya n’ebe dị nso n’ebe e nwere ihe àmà na-egosi ọnụmara o si. Ha ga-ama ụlọikwuu ha gburugburu ụlọikwuu nzute, cheekwa ya ihu.
34 Ndị Izrel mere ihe niile Jehova nyere Mosis n’iwu. Ọ bụ otú ahụ ka ha si maa ụlọikwuu ha n’ìgwè ebo atọ ebo atọ ha.+ Ọ bụkwa otú ahụ ka ha si akwali,+ ndị nke ọ bụla n’ezinụlọ ha nakwa n’ọnụmara n’ọnụmara.