53 Ndị Livaị ga-ebi n’ụlọikwuu ndị ha ga-ama gburugburu ụlọikwuu ahụ igbe ọgbụgba ndụ dị na ya,* ka a ghara iwesa nzukọ Izrel iwe.+ Ọ bụkwa ndị Livaị ga na-elekọta ụlọikwuu ahụ igbe ọgbụgba ndụ dị na ya.”+
8 “N’oge ahụ, Jehova họpụtara ebo Livaị+ ka ha na-ebu igbe ọgbụgba ndụ Jehova,+ ka ha nọrọ n’ihu Jehova na-ejere ya ozi, jirikwa aha ya na-agọzi ndị mmadụ,+ otú ha na-eme ruo taa.