2 Ndị Izrel niile wee malite ịkatọ* Mosis na Erọn.+ Nzukọ ahụ niile kwukwara okwu ọjọọ banyere ha, sị: “Ọ gaara akara anyị mma ma a sị na anyị nwụrụ n’Ijipt ma ọ bụkwanụ ma a sị na anyị nwụrụ n’ala ịkpa a.
13 Ọ̀ bụ obere ihe na i si n’ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya* kpọpụta anyị ka i gbuo anyị n’ala ịkpa a?+ Ugbu a, ị̀ chọkwuru ime onwe gị onyeisi anyị?*