6 “Kpọta ndị si n’ebo Livaị,+ meekwa ka ha guzo n’ihu Erọn onye nchụàjà. Ha ga na-ejere ya ozi.+ 7 Ha ga na-arụrụ Erọn ọrụ ha kwesịrị ịrụrụ ya, na-arụkwara nzukọ Izrel niile ọrụ ha kwesịrị ịrụrụ ha n’ihu ụlọikwuu nzute. Otú ha ga-esi eme ya bụ ịna-eje ozi dị iche iche gbasara ụlọikwuu.