-
Joshụa 12:1, 2Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
12 Ndị a bụ ndị eze chịrị ala ndị Izrel meriri, ndị ha weghaara ala ha dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Osimiri Jọdan, malite na Ndagwurugwu Anọn+ ruo n’Ugwu Hemọn,+ nakwa Araba niile nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ:+ 2 Saịhọn+ eze ndị Amọraịt, onye biri na Heshbọn. Ọ chịrị Aroa+ nke dị n’akụkụ Ndagwurugwu Anọn.+ Ọ bụkwa ya chịrị malite n’etiti ndagwurugwu ahụ ruo na Ndagwurugwu Jabọk. Ọ chịkwara ọkara Gilied. Ndagwurugwu Jabọk bụkwa ókè ala ndị Amọn.
-