16 Ha bịakwutere Belam, sị ya: “Belak nwa Zipọ kwuru, sị, ‘Biko, ekwela ka ihe ọ bụla gbochie gị ịbịakwute m, 17 n’ihi na m ga-akwụ gị ezigbo ụgwọ, m ga-emekwa ihe ọ bụla ị gwara m mee. Biko, bịa bụọrọ m ndị a ọnụ.’”
10 Belak wee wesa Belam ezigbo iwe. Belak kụrụ aka n’iwe sị Belam: “M kpọrọ gị ka ị bụọ ndị iro m ọnụ,+ ma naanị ihe i mere bụ ịgọzi ha ugboro atọ a. 11 Ugbu a, lawa n’ụlọ gị ozugbo. Ebu m n’obi ịkwụ gị ezigbo ụgwọ,+ ma Jehova egbochiela gị inweta ụgwọ m gaara akwụ gị.”