13 Belak sịrị ya: “Biko, soro m gaa ebe ọzọ ị ga-anọ hụ ha. Ị ga-ahụ naanị ụfọdụ n’ime ha. Ị gaghị ahụ ha niile. Si n’ebe ahụ bụọrọ m ha ọnụ.”+ 14 O wee kpọrọ ya gaa n’ala Zofim, n’elu Pisga,+ ma rụọ ebe ịchụàjà asaa, chụọkwa otu oké ehi na otu ebule n’àjà n’ebe ịchụàjà nke ọ bụla.+