42 Ụfọdụ n’ime ụmụ Simiọn gbagoro n’Ugwu Sia.+ Ha dị narị ụmụ nwoke ise (500). Ndị du ha gbagoo bụ Pelataya, Nearaya, Refeya, na Ọziel, bụ́ ụmụ Ịshaị. 43 Ha gbukwara ndị Amalek fọrọnụ,+ birizie ebe ahụ ruo taa.
14 ‘M ga-esi n’aka Izrel ndị m taa ndị Ịdọm ahụhụ.+ M ga-esi n’aka ha jiri iwe na ọnụma mee ndị Ịdọm ihe. Ndị Ịdọm ga-amarakwa na mụ ataala ha ahụhụ ihe ha mere.’+ Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru ihe a.”’