19 “Ọ bụrụ na unu anwaa anwaa chefuo Jehova bụ́ Chineke unu, wee soro chi ọzọ dị iche iche, fee ha ofufe, kpọọkwara ha isiala, ana m agwa unu taa na a ga-ebibirịrị unu.+
15 Ma, otú a ọmarịcha nkwa niile Jehova bụ́ Chineke unu kwere unu si mezuoro unu+ ka Jehova nwekwara ike isi mee ka ọdachi niile ọ gwara unu gbasara ha dakwasị unu, kpochapụkwa unu n’ọmarịcha ala a Jehova bụ́ Chineke unu nyere unu.+