11 Jehova gwara Mosis okwu ihu na ihu+ otú mmadụ si agwa mmadụ ibe ya okwu. Mgbe ọ bụla Mosis gaghachiri n’ebe ndị Izrel mara ụlọikwuu, Joshụa+ nwa Nọn, bụ́ onye ozi ya na onye na-enyere ya aka,+ anaghị esi n’ụlọikwuu ahụ apụ.
8 M na-agwa ya okwu ihu na ihu,*+ otú doro anya. Anaghị m agwa ya okwu n’ilu. Jehova na-apụtakwa n’ihu ya. Gịnịzi mere na egwu atụghị unu ikwujọ Mosis ohu m?”