22 Mgbe ebube m na-agafe, m ga-eme ka ị banye n’ọgba dị n’oké nkume a. M ga-ejikwa aka m kpuchie gị ruo mgbe m gafere. 23 M gafechaa, m ga-ewepụ aka m. Ị ga-ahụkwa azụ m, ma ị gaghị ahụ ihu m.”+
8 M na-agwa ya okwu ihu na ihu,*+ otú doro anya. Anaghị m agwa ya okwu n’ilu. Jehova na-apụtakwa n’ihu ya. Gịnịzi mere na egwu atụghị unu ikwujọ Mosis ohu m?”
38 Mosis a na ndị Izrel ibe ya nọrọ n’ala ịkpa. Ọ na-abụ mmụọ ozi+ gwa ya okwu+ n’Ugwu Saịnaị, yanwa agwa ndị nna nna anyị. Ọ nụkwara okwu Chineke, nke na-enye ndụ, ma gwa anyị ya.+