11 Ọ bụ n’ebe Jehova bụ́ Chineke unu ga-ahọrọ ka a nọrọ na-eto aha ya+ ka unu ga-eweta ihe niile m na-enye unu n’iwu ka unu weta, ya bụ, àjà unu a na-esu ọkụ, àjà unu ndị ọzọ, otu ụzọ n’ụzọ iri unu,+ onyinye ọ bụla unu kwere Jehova ná nkwa, na onyinye ọ bụla ọzọ unu chọrọ inye.
26 Unu ga-ejizi ego ahụ zụta ihe ọ bụla dị unu* mma, ya bụ, ehi, atụrụ, ewu, mmanya na ihe ọ bụla ọzọ na-aba n’anya, nakwa ihe ọ bụla dị unu mma. Unu ga-erikwa ihe n’ebe ahụ n’ihu Jehova bụ́ Chineke unu ma ṅụrịa ọṅụ, unu na ndị ezinụlọ unu.+