-
1 Samuel 28:7-11Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
7 N’ikpeazụ, Sọl sịrị ndị na-ejere ya ozi: “Chọọrọnụ m nwaanyị na-agba afa. + M ga-agakwuru ya jụọ ya ase.” Ndị na-ejere ya ozi asị ya: “E nwere nwaanyị na-agba afa n’En-dọọ.”+
8 Sọl wee jigharịa ejiji, yiri uwe ọzọ, ya na ndị ohu ya abụọ esoro gakwuru nwaanyị ahụ n’abalị. Sọl asị ya: “Biko, gbaara m afa, gwa m ihe ga-eme n’ọdịnihu,+ kpọpụtakwara m onye m ga-akpọrọ gị aha ya.” 9 Ma, nwaanyị ahụ sịrị ya: “Ị manụ ihe Sọl mere, otú o si mee ka a ghara inwe ndị na-agba afa na ndị na-akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu n’ala a.+ Gịnịzi mere i ji na-anwa isiri m* ọnyà ka e gbuo m?”+ 10 Sọl wee ṅụọrọ ya iyi n’aha Jehova, sị: “Eji m Jehova, bụ́ Chineke dị ndụ, na-aṅụ iyi na i mee ihe a, a gaghị asị na i mere ihe ọjọọ.” 11 Nwaanyị ahụ asị: “Ònye ka m ga-akpọpụtara gị?” Ya asị: “Kpọpụtara m Samuel.”
-
-
Aịzaya 8:19Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
19 Ọ bụrụ na ha asị unu: “Jụọnụ ndị na-agba afa ma ọ bụ ndị na-akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu ase, bụ́ ndị na-ebe ubé ka nnụnụ, na-ekwukwa okwu n’olu dị ala,” ùnu kwesịrị ime ihe ha kwuru? Ọ́ bụghị Chi ndị obodo ọ bụla ka ndị obodo ahụ kwesịrị ịna-ajụ ase? Ùnu kwesịrị ịjụ ndị nwụrụ anwụ ase gbasara ndị dị ndụ?+
-