9 Jehova wee sị m, ‘Esesala Moab okwu ma ọ bụ lụso ya agha n’ihi na agaghị m enye gị ala ya ọ bụla ka ọ bụrụ nke gị maka na ọ bụ ụmụ Lọt ka m nyere Aa ka ọ bụrụ nke ha.+
10 Ugbu a, legodị ihe ndị Amọn na-eme, ha na ndị Moab, na ndị si n’ala Sia bụ́ ugwu ugwu,+ ndị ị na-ekweghị ka ndị Izrel metụ aka mgbe ha si Ijipt na-apụta. Ha hapụrụ ha, ha ebibighịkwa ha.+
26 O sikwa n’otu mmadụ+ mee ka mmadụ niile nọ ná mba ọ bụla dịrị, meekwa ka ha biri n’elu ụwa niile.+ O kpebikwara oge ihe dị iche iche ga-eme nakwa ebe ụmụ mmadụ ga-ebi na ebe ha na-agaghị ebi.+