16 Ma, unu agaghị ahapụ ihe ọ bụla na-eku ume ka ọ dịrị ndụ n’obodo ndị a Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu ka ha bụrụ nke unu.+ 17 Kama, unu ga-ebibi ha kpamkpam, ya bụ, ndị Het, ndị Amọraịt, ndị Kenan, ndị Perizaịt, ndị Haịvaịt, na ndị Jebus,+ otú Jehova bụ́ Chineke unu nyere unu n’iwu,