17 A ga-ebibi obodo a na ihe niile dị n’ime ya.+ Ha niile bụ nke Jehova. Naanị Rehab+ nwaanyị akwụna ahụ ga-adị ndụ, ya na ndị niile ya na ha nọ n’ụlọ, n’ihi na o zoro ndị anyị dunyere ozi.+
28 Joshụa weghakwaara Makida+ n’ụbọchị ahụ ma jiri mma agha gbuo ndị bi na ya. O gbukwara eze ya nakwa onye ọ bụla* nọ na ya. O nweghịkwa onye ọ hapụrụ ndụ.+ O mere eze Makida+ ihe o mere eze Jeriko.