Joshụa
11 Ozugbo Jebin bụ́ eze Hezọ nụrụ ihe merenụ, o zigaara Jobab eze Medọn,+ eze Shimrọn, na eze Akshaf+ ozi. 2 O zigakwaara ndị eze na-achị ebe ugwu ozi, ha na ndị nke na-achị ọzara* dị n’ebe ndịda Kineret, na ndị nke na-achị Shefila* nakwa ebe ndịda Dọọ+ nke dị n’ebe ọdịda anyanwụ. 3 Ndị ọzọ o zigaara ozi bụ ndị Kenan+ bi n’ebe ọwụwa anyanwụ nakwa n’ebe ọdịda anyanwụ, ndị Amọraịt,+ ndị Het, ndị Perizaịt, ndị Jebus bi n’ebe bụ́ ugwu ugwu, na ndị Haịvaịt+ bi n’ala ala ugwu Hemọn,+ ya bụ, na Mizpa. 4 Ha na ndị agha ha niile, ndị dị ọtụtụ ka ájá dị n’ụsọ oké osimiri, wee pụta. Ha gbakwa ọtụtụ ịnyịnya na ụgbọ ịnyịnya ha ji alụ agha. 5 Mgbe ndị eze a niile zukọtara, ha mara ụlọikwuu n’akụkụ mmiri Merọm ka ha lụso ndị Izrel agha.
6 Jehova wee sị Joshụa: “Atụla ha egwu,+ n’ihi na n’ụdị oge a echi, m ga-enyefe ha niile n’aka ndị Izrel ka ha gbuo ha. Ị ga-ese ịnyịnya ha akwara,+ gbaakwa ụgbọ ịnyịnya ha ọkụ.” 7 Joshụa na ndị agha ya niile wee bịa lụso ha agha na mberede n’akụkụ mmiri Merọm. 8 Jehova wee nyefee ha n’aka ndị Izrel,+ ha ana-egbu ha ma chụrụ ha ruo Saịdọn bụ́ obodo ọtụtụ mmadụ bi.+ Ha chụkwaara ha ruo Misrefọt-meyim+ nakwa na Ndagwurugwu Mizpa,* n’ebe ọwụwa anyanwụ. Ha gbukatara ha ruo mgbe ọ na-enweghịzi onye fọdụrụ n’ime ha.+ 9 Joshụa mere ha ihe Jehova gwara ya mee ha. O sere ịnyịnya ha akwara, gbaakwa ụgbọ ịnyịnya ha ọkụ.+
10 Joshụa laghachikwara weghara Hezọ, jirikwa mma agha gbuo eze ya,+ n’ihi na Hezọ bụbu alaeze kacha ike n’alaeze ndị a niile. 11 Ha ji mma agha gbuo mmadụ* niile nọ na ya, bibiekwa ha.+ O nweghị ihe ọ bụla na-eku ume ha hapụrụ ndụ.+ Joshụa gbakwara Hezọ ọkụ. 12 O weghaara obodo niile ndị eze a na-achị, jirikwa mma agha gbuo ndị eze ha niile+ ma merie ha. O bibiri ha,+ otú Mosis ohu Jehova gwara ya. 13 Ma, o nweghị obodo dị n’elu mkputamkpu ala nke ndị Izrel gbara ọkụ ma e wezụga Hezọ. Ọ bụ naanị ya bụ obodo Joshụa gbara ọkụ. 14 Ndị Izrel bukọọrọ ihe niile ha kwatara n’obodo ndị ahụ, kpụrụkwa anụ ụlọ ha.+ Ma, ha ji mma agha na-egbu ndị mmadụ ruo mgbe ha gbuchara ha niile.+ O nweghị onye ọ bụla na-eku ume ha hapụrụ ndụ.+ 15 Ihe niile Jehova gwara Mosis ohu ya ka Mosis gwara Joshụa.+ Joshụa mekwara ha niile. O nweghị ihe ọ bụla Jehova gwara Mosis nke Joshụa na-emeghị.+
16 Joshụa meriri obodo ndị a niile: obodo ndị dị n’ebe bụ́ ugwu ugwu na Juda, Negeb* niile,+ ala Goshen niile, Shefila,*+ Araba,+ nakwa obodo ndị dị n’ebe bụ́ ugwu ugwu n’Izrel na ebe mkpọda obodo ndị ahụ. 17 O meriri obodo ndị dị malite n’Ugwu Helak, nke dị nso na Sia, ruo Bel-gad+ nke dị na Ndagwurugwu Lebanọn, n’ala ala Ugwu Hemọn.+ Joshụa merikwara ndị eze ha niile, nwụde ha, gbuokwa ha. 18 Joshụa na ndị eze ndị a niile lụtere agha aka. 19 O nweghị obodo bịara ka ha na ndị Izrel mee udo ma e wezụga ndị Haịvaịt bi na Gibiọn.+ Ha meriri obodo ndị ọzọ niile n’agha.+ 20 Ọ bụ Jehova hapụrụ ha ka obi ha kpọchie+ nke mere ka ha lụso ndị Izrel agha, ka o wee bibie ha n’emereghị ha ebere.+ A ga-ala ha n’iyi otú Jehova gwara Mosis.+
21 Joshụa gakwara n’ebe bụ́ ugwu ugwu kpochapụ ndị Anakim+ ndị bi na Hebrọn, Diba, Enab, na ndị nke bi n’ebe bụ́ ugwu ugwu na Juda nakwa n’Izrel. Joshụa bibiri ha na obodo ha.+ 22 O nweghị ndị Anakim fọrọ n’ala ndị Izrel. Ọ bụ naanị na Gaza,+ Gat,+ nakwa n’Ashdọd+ ka ha fọrọ.+ 23 Joshụa wee weghara ala ahụ niile otú Jehova kwere Mosis ná nkwa.+ Joshụa nyekwara ya ndị Izrel ka ọ bụrụ ihe ha ketara. O kenyere ebo ọ bụla nke ruuru ya.+ A lụghịkwa agha n’obodo ahụ ọzọ.+