22 Mgbe ha garuru Negeb, ha bịarutere Hebrọn,+ bụ́ ebe Ahaịman, Shishaị, na Talmaị,+ bụ́ ndị Anakim,+ bi. Afọ asaa agaala a rụrụ Hebrọn tupu a rụọ Zoan n’Ijipt.
28 Olee ụdị ebe anyị na-aga? Ụmụnne anyị mere ka obi mapụ anyị.*+ Ha sịrị: “Ndị bi n’ebe ahụ dị ukwuu ma too ogologo karịa anyị. Obodo ha dị ukwuu, a rụsikwara ha ike ruo n’eluigwe.*+ Anyị hụkwara ndị Anakim+ n’ebe ahụ.”’
13 Jehova gwara Joshụa ka o nye Keleb+ nwa Jefune ala ná mpaghara ebe o nyere ụmụ Juda. Ya enye ya Kiriat-aba (Aba a bụ nna Anak), ya bụ, Hebrọn.+14 N’ihi ya, Keleb chụpụrụ ụmụ Anak atọ n’ebe ahụ.+ Ha bụ, Shishaị, Ahaịman, na Talmaị.+