25 Ndị Izrel wee weghara obodo ndị a niile. Ha wee biri n’obodo ndị Amọraịt niile,+ ya bụ, na Heshbọn na ime obodo niile ndị dị ya nso. 26 N’ihi na Heshbọn bụ obodo Saịhọn, eze ndị Amọraịt. Ọ bụ ya lụsoro eze Moab agha ma nara ya ala ya niile ruo Anọn.