-
Ọnụ Ọgụgụ 27:1, 2Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
27 Ụmụ nwaanyị Zelofehad+ wee bịa. Zelofehad bụ nwa Hifa, nwa Gilied, nwa Mekia, nwa Manase, onye si n’ezinụlọ ndị si n’ebo Manase nwa Josef. Aha ụmụ nwaanyị ọ mụtara bụ Mala, Noa, Họgla, Milka, na Teza. 2 Ha bịara guzo n’ihu Mosis, Elieza onye nchụàjà, ndị isi,+ nakwa n’ihu nzukọ niile ahụ n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute, sị:
-